Lines Matching refs:site

9 Ebe ọ dị mkpa, ma ọ bụrụ na a chọghi ikwanye mmadụ ka o were oke nnupu isi sogide ochịchị aka ike na mmegbu dị ka ihe ikpeazụ ọ pụrụ ime, na a ga‐echedo ikike mmadụ nwegasịrị site n'usoro iwu.
15 Ebe mba ndi nọ n'otu a eweputala onwe ha maka inweta, site na njikọ aka ha na United Nations, nkwalite nsọpụrụ n'ụwa nile na idebe iwu gbasara ikike na ohere ntọala mmadụ nwegasịrị.
21 Ọgbakọ ozuzu a bu General Assembly Na‐akwado Nkuwuwapụta Uwa Nile nke a banyere Ikike Maadụ Nwegasịrị ka ọ bụrụ ihe ngosi ọganihu nke ndi mmadụ nile na mba nile, nke bụ na onye ọ bụla nakwa ngalaba ọ bụla nke obodo bụ Nkwuwapụta a n'obi, ga‐agbasi mbọ ike, site na nkuzi na ọzụzụ, ịkwalite nsọpụrụ maka ikike na ohere ndi a, ma sitekwa n'atụmatụgasị nke mba na nke jikoro mba na mba na‐aga n'ihu ime ka a ghtachaa ma debechaa ha n'ụwa nile ma n'ime mba ndi nọ n'otu a makwa n'ime mba ndi ọzọ nọ n'okpuru ọchịchị ha.
47 Onye ọ bụla nwere ikike ikpe mmezi ga‐enwe nkawado ọha na eze nke ndi ụlọ ikpe tozuru etozu nke obodo ma e nwee omume ndi megidere ikike ntọala nke e nyegasịrị ya site n'usoro ọchịchị ma ọbụ iwu.
79 1. Ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị toruru ogo, n'enweghi ihe njigide ọ bụla site n'agbụrụ, ọbụbụ nwa afọ ma ọ bụ okpukpere chi, nwere iki ịlụ nwunye ma ọ bụ di nakwa ịmalite ezi na ụlọ nwere ikike nha anya n'ihe gbasara ọlụlụ di na nwunye, obibi di na nwunye na mgbasa ya.
83 3. Ezi na ụlọ bụ nkeji ntaọala site n'okike nke ndi nọ n'obodo ọ bụla; n'ihi ya, o kwesiri inwe nchedo ndi obodo na nke Steti.
91 Onye ọ bụla nwere ikike echiche, mmụọ na okpukpere chi masịrị ya; ikike a gbakwunyere ohere ịgbanwe okpukpere chi ma ọ bụ nkwenye ya, na ohere nke sọsọ ya ma ọ bụ ya na ndi ọzọ nwere n'ọgbọ ọha ma ọ bụ na nzuzo, igosiwapụta okpukpere chi ma ọ bụ nkwenye ya site na nkuzi, omume, ofufe na ndebe iwu.
94 Onye ọ bụla nwere ohere uche aka ya na nkwupụta uche ya: ikike a gbakwunyere ohere ịkwụdo n'echiche n'enweghi nnyonye anya na nke ịchọ, ịnata na ịgbasa ozi na echiche site n'ụzọ ọ bụla n'agbanyeghi oke ala.
102 1. Onye ọ bụla nwere ikike iso n'ochichi obodo ya, n'onwe ya ma ọ bụ site na ndi nnọchite anya a họpụtara n'enweghi mmanye.
106 3. Uche ọha na eze ga‐abụ ihe mgbakwasị ukwu nke ike ọchịchị obodo; A ga‐egosipụta uche nke a site n'ezi ntụli aka a ga na‐eme kwa mgbe nke onye ọ bụla nwere ikike nha anya iso mee n'ụzọ nzuzo ma ọ bụ n'ụzọ ndi ọzọ ga‐enyekwa ya ohere ịtụliri onye masịrị ya aka.
109 Onye ọ bụlan,n'ọnọdụ ya di ka onye obodo, nwere ikike inweta nchedo obodo ma tozukwa oke inweta, site n'agbamdọ obodo ya na enyemaka mba ndi ọzọ dị ka nhazi na akụ na ụba Steti ọ bụla siri dị, ikike sitere n'akụ na ụba, ọnọdụ n'obodo na omenala, bụ ikike ndi dị oke mkpa mụ ugwu ya na ohere ntozu oke ya dị ka mmadụ.
112 1. Onye ọ bụla nwere ikike ịrụ ọrụ, iji aka ya họrọ ọrụ ọ ga‐aru, inọ n'ọnọdụ ọrụ ndi ruuru ya ma dịkwa mma, na inweta nchedo site n'ọnọdụ enweghiọrụ.