Lines Matching refs:ha

13 Ebe ndi otu jikọtara mba ụwa nile bụ United Nations, n'ime Chata bụ akwụkwọ nyere ha ike kwupụtakwara ọzọ okwukwe ha n'ikike ntọala mmadụ nwegasịrị, n'ugwu na uru nke mmadụ, ya na nha anya ikike ndi dịrị nwoke na nwanyị, were nweekwa njikere ịkwalite ọganihu obodo na ezi obibi ndụ nke ndi mmadụ nweere onwe ha.
15 Ebe mba ndi nọ n'otu a eweputala onwe ha maka inweta, site na njikọ aka ha na United Nations, nkwalite nsọpụrụ n'ụwa nile na idebe iwu gbasara ikike na ohere ntọala mmadụ nwegasịrị.
21 Ọgbakọ ozuzu a bu General Assembly Na‐akwado Nkuwuwapụta Uwa Nile nke a banyere Ikike Maadụ Nwegasịrị ka ọ bụrụ ihe ngosi ọganihu nke ndi mmadụ nile na mba nile, nke bụ na onye ọ bụla nakwa ngalaba ọ bụla nke obodo bụ Nkwuwapụta a n'obi, ga‐agbasi mbọ ike, site na nkuzi na ọzụzụ, ịkwalite nsọpụrụ maka ikike na ohere ndi a, ma sitekwa n'atụmatụgasị nke mba na nke jikoro mba na mba na‐aga n'ihu ime ka a ghtachaa ma debechaa ha n'ụwa nile ma n'ime mba ndi nọ n'otu a makwa n'ime mba ndi ọzọ nọ n'okpuru ọchịchị ha.
24 A mụrụ mmadụ nile n'ohere nakwa nha anya ugwu na ikike. E nyere ha uche na mmụọ ime ihe ziri ezi nke na ha kwesiri ịkpaso ibe ha agwa n'obi nwanne na nwanne.
44 Madụ nile ha otu n'usoro iwu, tozukwa oke n'enweghi ịkpa oke ọ bụla inweta nchedo nha anya n'usoro iwu. Madụ nile tozukwara oke nchedo nha anya megide ụdị ịkpa oke ọ bụla mebiri Nkwuwapụta nke a ma megidekwa ikwanye mmadụ ọ bụla n'ụdị ikpa oke a.
81 2. Ọlụlụ di na nwunye ga‐abụrịrị ma e nwere nkwekọrịta si n'obi zuru oke nke ndi chọrọ ilu onwe ha.
126 2. Ọnọdụ nne na nke nwata kwesiri inwe mkpachapụrụ anya na enyemaka pụrụ iche. Ụmụaka nile, ma a mụrụ ha n'alụmdi na nwuye ma a mụghi, ga‐enwe otu ụdị nchedo obodo a.
129 1. Onye ọ bụla nwere ikike inweta ọzụzụ. Ọzụzụ ga‐abụ n'efu, ọ kacha n'oge mmalite bụkwa oge ntọala ya. Ọzụzụ ụmụntakịrị ga‐abụ manye. Ọzụzụ nka na ụzụ na nke ọrụ aka ga‐adị maka onye ọ bụla chọrọ ha; ọzụzu dị elu ga‐erukwa onye ọ bụla aka n'usoro onye jiri tozuo maka ya.
133 3. Nne na nna nwere ikike izizi ịhọrọ ụdị ozụzụ a ga‐enye ụmụ ha.
148 3. A gaghị egosipụta ikike na ohere ndi a n'ụzọ ọ bụla ha ga‐esi megide ebumnuche na usoro iwu nke United Nations.