Lines Matching refs:a

5 Ebe ọ bụ na nghọta ugwu ekere uwa na ikike nha anya a pụghị ịnapụ mmadụ nke dirị onye ọ bụla bi n'ụwa bụ ntụala nke inwere onwe, ikpe nkwụmọtọ na udo n'elụ ụwa.
7 Ebe nleghara anya na nleli ikike mmadu nwegasịrị emeela ka e nwee akparamagwa enweghi uche nke gbawara obi mmadụ nile, a bịakwa ọbịbịa ụwa ebe ndi mmadụ ga‐enwejupụta ohere ikwu okwu na inwe nkwenye nakwa nlihapụ n'ụjọ na ụkọ, abụrụ ihe a mara n'okwa dị ka olile anya kachasị ibe ya nke mmadụ nkịtị.
9 Ebe ọ dị mkpa, ma ọ bụrụ na a chọghi ikwanye mmadụ ka o were oke nnupu isi sogide ochịchị aka ike na mmegbu dị ka ihe ikpeazụ ọ pụrụ ime, na a ga‐echedo ikike mmadụ nwegasịrị site n'usoro iwu.
15 Ebe mba ndi nọ n'otu a eweputala onwe ha maka inweta, site na njikọ aka ha na United Nations, nkwalite nsọpụrụ n'ụwa nile na idebe iwu gbasara ikike na ohere ntọala mmadụ nwegasịrị.
17 Ebe nghọta onye ọ bụla banyere ikike na ohere ndi a kachasị dịrị mkpa maka imejupụta nkwekọrịta nke a.
21 Ọgbakọ ozuzu a bu General Assembly Na‐akwado Nkuwuwapụta Uwa Nile nke a banyere Ikike Maadụ Nwegasịrị ka ọ bụrụ ihe ngosi ọganihu nke ndi mmadụ nile na mba nile, nke bụ na onye ọ bụla nakwa ngalaba ọ bụla nke obodo bụ Nkwuwapụta a n'obi, ga‐agbasi mbọ ike, site na nkuzi na ọzụzụ, ịkwalite nsọpụrụ maka ikike na ohere ndi a, ma sitekwa n'atụmatụgasị nke mba na nke jikoro mba na mba na‐aga n'ihu ime ka a ghtachaa ma debechaa ha n'ụwa nile ma n'ime mba ndi nọ n'otu a makwa n'ime mba ndi ọzọ nọ n'okpuru ọchịchị ha.
27 Onye ọ bụla tozuru iwe ikike na ohere nile e wepụtara na Nkwuwapụta nke a , n'enweghi ịkpa oke ọ bụla dị ka nke agbụrụ; ụcha akpụkpọ ahụ, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, asụsụ, okpukpe chi, echiche banyere ọchịchị ma ọ bụ ihe ọzọ, obodo ma ọ bụ ọ n'obodo akụ, ọnọdụ ọmụmụ ma ọ bụ ọnọdụ ọzọ.
29 Ozọkwa, a gaghị enwe ịkpa oke gbadoro ụkwụ n'ọnọdụ ọchịchị, nlekọta ma ọ bụ mmekọrịta mba na mba, nke obodo ma ọ bụ oke ala onye nọ na ya, n'agbanyeghi ma ebe ahụ o nwe onwe ya, ọ nọ na nlekọta anya, ọ nọ n'okpuru ọchịchị ọzọ ma o nwere ihe ọzọ gbochiri ya inwe ntozu oke dị ka mba.
35 Ọ dịghị onye a ga‐ejigide n'ọnọdu ohu ma ọ bụ odibọ a ga‐amachi ịkpa ma ọ bụ ire ohu n'ụdị ọ bụla.
38 Ọ dịghị onye a ga‐akwagide n'oke ntaramahụhụ, ma ọ bụ na mmeso omume na ntaramahụhụ obi ọjọọ, obi tara mmiri ma ọ bụ nke naz‐ewetu ugwu mmadụ.
44 Madụ nile ha otu n'usoro iwu, tozukwa oke n'enweghi ịkpa oke ọ bụla inweta nchedo nha anya n'usoro iwu. Madụ nile tozukwara oke nchedo nha anya megide ụdị ịkpa oke ọ bụla mebiri Nkwuwapụta nke a ma megidekwa ikwanye mmadụ ọ bụla n'ụdị ikpa oke a.
50 Ọ dịghị onye a ga‐akwagide na njide n'efu, mkpọchi ma ọ bụ nchụpụ n'obodo ya.
56 1. Onye ọ bụla e boro ebubo ida iwu nwere ntaramahụhụ tosiri ka e kwenye na o nweghi ụta tutu a chọpụta na ụta dịrị ya n'usoro iwu, n'ikpe e kpere n'ihu ọha, ebe e nyere ya ohere nile dị mkpa maka iji zara ọnụ ya.
58 2. Ọ dịghị onye a ga‐ama ikpe ịda iwu ọ bụla nwere ntaramahụhụ maka ihe o mere ma ọ bụ ihe ọ hapụrụ ime nke n'abụghị ịda iwu nwere ntaramahụhụ n'oge e mere ya, ma ọ bụ n'usoro iwu obodo ma ọ bụ nke di, n'etiti mba na mba. N'otu aka ahụ, a gaghị enye mmadụ ntaramahụhụ karịri nke a na‐enye n'oge a dara iwu ahụ nwere ntaramahụhụ.
61 Ọ dịghị onye a ga‐akwagide na nnyonye anya ezighi ezi n'ihe ọ‐cọghi ka ọha mara, ezinulo ya, ụlọ ya ma ọ bụ nzikọrịta ozi ya, ma ọ bukwa na mbuso agha megide ugwu na ezi aha ya. Onye ọ bụla newere ikike ịchọ nchedo iwu megide nnyonye anya ma ọ bụ mbuso agha ndị a.
71 2. A gaghị akpọku ikike a n'ihe gbasara agbamakwụkwọ sitere ezie na mmebi iwu n'abụghị nke ndọrọndọrọ ọchịchị ma ọ bụ omume megidere ebumnuche na usoro nke United Nations.
76 2. Ọ dịghị onye a ga‐esi n'uzọ na‐edoghi anya napụ ọbụbụ nwa afọ ya ma ọ bụ napụ ikike ịgbanwe ala ọ nwa afọ na ya.
88 2. Ọ dịghị onye a ga‐esi n'ụzọ na‐edoghi any napụ ihe o nwere.
91 Onye ọ bụla nwere ikike echiche, mmụọ na okpukpere chi masịrị ya; ikike a gbakwunyere ohere ịgbanwe okpukpere chi ma ọ bụ nkwenye ya, na ohere nke sọsọ ya ma ọ bụ ya na ndi ọzọ nwere n'ọgbọ ọha ma ọ bụ na nzuzo, igosiwapụta okpukpere chi ma ọ bụ nkwenye ya site na nkuzi, omume, ofufe na ndebe iwu.
94 Onye ọ bụla nwere ohere uche aka ya na nkwupụta uche ya: ikike a gbakwunyere ohere ịkwụdo n'echiche n'enweghi nnyonye anya na nke ịchọ, ịnata na ịgbasa ozi na echiche site n'ụzọ ọ bụla n'agbanyeghi oke ala.
99 2. Ọ dịghị onye a da‐amanye isoro n'otu ọ bụla.
102 1. Onye ọ bụla nwere ikike iso n'ochichi obodo ya, n'onwe ya ma ọ bụ site na ndi nnọchite anya a họpụtara n'enweghi mmanye.
106 3. Uche ọha na eze ga‐abụ ihe mgbakwasị ukwu nke ike ọchịchị obodo; A ga‐egosipụta uche nke a site n'ezi ntụli aka a ga na‐eme kwa mgbe nke onye ọ bụla nwere ikike nha anya iso mee n'ụzọ nzuzo ma ọ bụ n'ụzọ ndi ọzọ ga‐enyekwa ya ohere ịtụliri onye masịrị ya aka.
116 3. Onye ọ bụla na‐arụ ọrụ nwere ikike ịnata akwụmụgwọ ruuru ya ma dịkwa mma nke ga‐eme ka ya na ezi na ụlọ ya nwee obidi ndụ kwesiri ugwu mmadụ, nke a gbakwunyere, ma ọ dị mkpa, ihe ndi ọzọ e ji echedo ndụ n'obodo.
126 2. Ọnọdụ nne na nke nwata kwesiri inwe mkpachapụrụ anya na enyemaka pụrụ iche. Ụmụaka nile, ma a mụrụ ha n'alụmdi na nwuye ma a mụghi, ga‐enwe otu ụdị nchedo obodo a.
131 2. Ọzụzu ka a ga‐eji sogide nkwalite ntozu oke nke mmadụ na kwadosi ike nke nsọpụrụ maka ikike na ohere ntọala mmadụ nwegasiri. Ọ ga‐akwalite nghọta, ndidi na adimnamma n'etiti mba, agbụrụ ma ọ bụ otu okpukpere chi nile, ma kwalitekwa emereme nile nke United Nations na‐eme ka udo dịrị.
133 3. Nne na nna nwere ikike izizi ịhọrọ ụdị ozụzụ a ga‐enye ụmụ ha.
138 2. Onye ọ bụla nwere ikike nchedo uru ndi a hụrụ anya na ndi a hụghị anya sitere na mmepụta nke sayensi, edemede ma ọ bụ nka, nke e si n'aka ya nweta.
141 Onye ọ bụla tozuru oke inwe nbazi ime obodo na nke jikọtara mba na ibe ya, nke ga‐ekwe ka ikike na ohere ndi e gosipụtara na Nkuwuwaputa a zuo ezuo.
146 2. Na ngosipụta ikike na ohere ndi o nwegasịrị, onye ọ bụla ga‐enwe nrube isi nye sọsọ mmachi ndi sitere n'usoro iwu a mara iji mee ka e nweta ezi nghọta na nsọpụrụ ikike na ohere ndi ọzọ nwegasịrị na iji nweta ezi ihe mgnakwasị ụkwụ maka ezi mkparamagwa, ndebe iwu ọha na ọdị mma mmadụ nile nọ n'obodo onye kwuo uche‐ya.
148 3. A gaghị egosipụta ikike na ohere ndi a n'ụzọ ọ bụla ha ga‐esi megide ebumnuche na usoro iwu nke United Nations.
151 Onweghi ihe nọ na Nkuwuwapụta nke a a ga‐akowa dị ka ihe nyere Steti, otu ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ikike ọ bụla itinye aka na emereme ọ bụla ma ọ bụ ime omume ọ bụla iji mebi ikike na ohere ọ bụla ndi a kọwapụtara n'ebe a.